6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.
7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”
9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?
10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”