30“Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe; ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị. Dịka ọdụm na-adọgbu anụ, mma agha unu eripịala ndị amụma unu.
31“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?
32Nwaagbọghọ ọ na-echefu ọla ịchọ mma ya, nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ na-echefu ngwa ịchọ mma ya? Ma nʼime ọtụtụ ụbọchị nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị m echefuola m.
33Lee ka unu si bụrụ ndị ọka nʼịgbaso ịhụnanya. Ọ bụladị ụmụ nwanyị dị njọ karịsịa nwere ike ịmụta ihe site nʼụzọ unu.
34Nʼuwe unu ka achọtara ọbara ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere, nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ. Ma unu gara nʼihu