Jeremaya 2

Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ, bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị, duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu, nʼala ọzara na ala olulu jupụtara, ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị, ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’

Jeremiah 2:6 (UKJV) Neither said they, Where is the LORD that brought us up out of the land of Egypt, that led us through the wilderness, through a land of deserts and of pits, through a land of drought, and of the shadow of death, through a land that no man passed through, and where no man dwelt?

4Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel.

5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị?

6Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ, bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị, duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu, nʼala ọzara na ala olulu jupụtara, ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị, ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’

7Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ, ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya. Ma unu bara merụọ ala m unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ.

8Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.