7Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ, ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya. Ma unu bara merụọ ala m unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ.
8Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi.
9“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu.
10Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya, zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma, ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a.
11O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe? (Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.) Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi gbanwere ebube ha.