8Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.
9Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.
10Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”
11Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha; nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m. Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu; a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi.
12Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.