15Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!”
16Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie.
17Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m, hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m, ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi.
18Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?