Jeremaya 24

Aga m eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe ịsọ oyi, na ihe na-eweta obi ọjọọ. Ha ga-aghọ ihe ịta ụta, na ihe e ji akọ akụkọ, na ihe nkọcha na ihe ịbụ ọnụ nʼebe ọbụla m mere ka ha gaa biri.

Jeremiah 24:9 (UKJV) And I will deliver them to be removed into all the kingdoms of the earth for their hurt, to be a reproach and a proverb, a taunt and a curse, in all places where I shall drive them.

7Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m.

8“ ‘Ma dịka fiig ọjọọ ndị a, bụ ndị dị njọ nke ukwuu na-enweghị ike iri ha eri,’ Onyenwe anyị sịrị, ‘otu a ka m gaa emeso Zedekaya, eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ahụ niile fọdụrụ ndụ na Jerusalem, ma ha bi nʼime ya, maọbụ biri nʼIjipt.

9Aga m eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe ịsọ oyi, na ihe na-eweta obi ọjọọ. Ha ga-aghọ ihe ịta ụta, na ihe e ji akọ akụkọ, na ihe nkọcha na ihe ịbụ ọnụ nʼebe ọbụla m mere ka ha gaa biri.

10Aga m ezigakwa mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe nʼetiti ha, tutu ruo mgbe e mere ka ha gwụsịa nʼelu ala ahụ nke m nyere ha, nyekwa ndị bụ nna nna ha.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.