Jeremaya 25

Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.

Jeremiah 25:10 (UKJV) Moreover I will take from them the voice of delight, and the voice of gladness, the voice of the bridegroom, and the voice of the bride, the sound of the millstones, and the light of the candle.

8Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.

9Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.

10Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.

11Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.

12“Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.