Jeremaya 25

Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.

Jeremiah 25:4 (UKJV) And the LORD has sent unto you all his servants the prophets, rising early and sending them; but all of you have not hearkened, nor inclined your ear to hear.

2Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:

3Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu.

4Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.

5Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.

6Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.