Jeremaya 27

Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe?

Jeremiah 27:17 (UKJV) Hearken not unto them; serve the king of Babylon, and live: wherefore should this city be laid waste?

15‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’ ”

16Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.

17Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe?

18Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn.

19Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.