1Na mmalite ọchịchị Zedekaya, nwa Josaya eze Juda, okwu ndị a si nʼọnụ Onyenwe anyị rute Jeremaya ntị.
2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Jiri akpụkpọ anụ dị warawara na ụfọdụ okporo igwe, meere onwe gị ụdị agbụ ahụ a na-amanye ụmụ ehi nʼolu, nyakwasị ya nʼolu gị.
3Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi.
4Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị,