Jeremaya 27

E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem.

Jeremiah 27:21 (UKJV) Yea, thus says the LORD of hosts, the God of Israel, concerning the vessels that remain in the house of the LORD, and in the house of the king of Judah and of Jerusalem;

19Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a,

20nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn na-eburughị mgbe o sitere na Juda na Jerusalem, dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, bụ eze Juda, na ndị niile a na-asọpụrụ bulaa Babilọn.

21E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem.

22‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.