Jeremaya 27

Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.

Jeremiah 27:7 (UKJV) And all nations shall serve him, and his son, and his son's son, until the very time of his land come: and then many nations and great kings shall make use of him.

5Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma.

6Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu.

7Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.

8“ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

9Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.