14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ”
15Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị Onyenwe anyị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha.
16Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’ ”
17Nʼọnwa asaa nke afọ ahụ Hananaya onye amụma nwụrụ.