14Aga m emekwa ka unu chọta m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “meekwa ka unu bụ ndị a dọtara nʼagha lọta. Aga m esitekwa na mba ahụ niile m chụgara unu chịkọtaa unu, kpọghachitekwa unu nʼebe ahụ m si chụpụ unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
15Unu pụrụ ị sị, “Onyenwe anyị akpọlite ndị amụma nye anyị na Babilọn.”
16Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere eze ahụ na-anọkwasị nʼocheeze Devid, na banyere ndị mmadụ niile fọdụrụ nʼobodo a, bụ ụmụnne unu ndị ahụ na-esoghị unu gaa ebe e mere ka ha ga biri na mba ọzọ.
17E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata.
18Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ.