Jeremaya 31

Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 31:32 (UKJV) Not according to the covenant that I made with their fathers in the day that I took them by the hand to bring them out of the land of Egypt; which my covenant they brake, although I was an husband unto them, says the LORD:

30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.

31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.

32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.