9Ya mere, azụrụ m ala ahụ dị nʼAnatot site nʼaka nwanna m Hanamel. Atụpụtara m ọlaọcha shekel iri na asaa ọnụahịa ala ahụ, jiri ya kwụọ ya ụgwọ.
10Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ.
11Eweere m akwụkwọ ịzụta ala ahụ a kara akara, nke a nyachikwara anyachi, ebe e dere ihe banyere ọzụzụ na orire nke ala ahụ, werekwa ụdị akwụkwọ ahụ nke a na-anyachighị anyachi,
12nyefee ha nʼaka Baruk nwa Neraya, nwa Mahseia, nʼihu Hanamel nwanna m, na nʼihu ndị akaebe ndị ọzọ, ndị aka ha dị nʼakwụkwọ ahụ, na nʼihu ndị Juu ndị ọzọ, ndị nọ nʼogige ụlọ ndị agha ahụ.
13“Nʼihu ha, enyere m Baruk iwu ndị a sị ya,