Jeremaya 32

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Dịka m mere ka ihe ọjọọ ukwuu a niile bịakwasị ndị a, otu a ka m ga-esikwa mee ka ezi ihe ahụ niile m kwere ha na nkwa bịakwasị ha.

Jeremiah 32:42 (UKJV) For thus says the LORD; Like I have brought all this great evil upon this people, so will I bring upon them all the good that I have promised them.

40Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha.

41Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a.

42“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Dịka m mere ka ihe ọjọọ ukwuu a niile bịakwasị ndị a, otu a ka m ga-esikwa mee ka ezi ihe ahụ niile m kwere ha na nkwa bịakwasị ha.

43A ga-azụkwa ọhịa nʼala a unu na-asị na ọ bụ ala tọgbọrọ nʼefu, nke mmadụ na anụmanụ na-adịghị nʼime ya, ala nke e nyefere nʼaka ndị Babilọn.

44A ga-ejikwa ọlaọcha zụọ ala ubi, deekwa ihe banyere orire na ọzụzụ ya nʼakwụkwọ. A ga-aka akwụkwọ ndị ahụ akara nʼihu ndị akaebe, nʼala Benjamin, na nʼobodo nta niile dị gburugburu Jerusalem, ma nʼala Juda, na nʼobodo dị nʼala ugwu ugwu, na nke dị na mgbada ugwu niile dị nʼọdịda anyanwụ, na nke dị na Negev, nʼihi na aga m esite nʼobodo ndị ahụ dọtara ha nʼagha buuru ha gaa kpọlata ha. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.