Jeremaya 33

Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

Jeremiah 33:19 (UKJV) And the word of the LORD came unto Jeremiah, saying,

17Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel.

18Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ”

19Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

20“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha,

21mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.