20“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha,
21mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
22Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ”
23Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
24“Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.