10Ọ bụkwa nʼụlọ ikwuu ka anyị na-ebi dị ka nna nna anyị Jehonadab nyere anyị nʼiwu.
11Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.”
12Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya
13Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, ‘Ọ bụ na unu agaghị esite nʼịdọ aka na ntị mụta irubere okwu m isi?’ ka Onyenwe anyị kwupụtara.
14‘Jehonadab nwa Rekab nyere ụmụ ụmụ ya iwu sị ha aṅụla mmanya, ha na-edebe iwu ahụ. Ruo taa, ha adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu mgbe na mgbe, ma unu jụrụ irubere m isi.