30Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim eze Juda; Ọ gaghị amụta onye ga-anọ nʼocheeze Devid. Ọzọ, a ga-atụfu ozu ya nʼebe igirigi nke abalị ga-adakwasị ya, ebe okpomọkụ nke ehihie ga-erute ya.
31Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’ ”
32Ya mere, Jeremaya weere akwụkwọ ọzọ nye Baruk ode akwụkwọ, bụ nwa Neraya, dịka Jeremaya na-akpọpụta okwu, Baruk depụtakwara nʼakwụkwọ okwu ndị ahụ niile, nke Jehoiakim eze Juda surere nʼọkụ. A tụkwasịkwara nʼelu ha ọtụtụ okwu ndị ọzọ nke dịka ha.