Jeremaya 39

Ma aga m anapụta gị nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A gaghị enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị na-atụ egwu ha.

Jeremiah 39:17 (UKJV) But I will deliver you in that day, says the LORD: and you shall not be given into the hand of the men of whom you are afraid.

15Ma nʼoge ahụ, Jeremaya nọ dị ka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị sị ya,

16“Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị.

17Ma aga m anapụta gị nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A gaghị enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị na-atụ egwu ha.

18Aga m azọpụta gị. Ị gakwaghị ada site na mma agha kama ị ga-agbapụkwa na ndụ, nʼihi na ị tụkwasịrị m obi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.