Jeremaya 4

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị, “Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị; unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu.

Jeremiah 4:3 (UKJV) For thus says the LORD to the men of Judah and Jerusalem, Break up your fallow ground, and sow not among thorns.

1“Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka Onyenwe anyị kwubiri, mụ ka ị ga-alọghachikwute,” “Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m, hapụ isi ebe m nọ kpafuo,

2ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omume ṅụọ iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na ya nyakwaa isi nʼime ya.”

3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị, “Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị; unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu.

4Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị, biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere, ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya.

5“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị, ‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’ Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya. Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.