Jeremaya 4

“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”

Jeremiah 4:9 (UKJV) And it shall come to pass at that day, says the LORD, that the heart of the king shall perish, and the heart of the princes; and the priests shall be astonished, and the prophets shall wonder.

7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.

8Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe; kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa, nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya.

9“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”

10Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.”

11Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.