Jeremaya 41

Ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha na Mizpa, chigharịrị gafee nʼebe Johanan nwa Kariya nọ.

Jeremiah 41:14 (UKJV) So all the people that Ishmael had carried away captive from Mizpah cast about and returned, and went unto Johanan the son of Kareah.

12ha duuru ndị agha ha niile pụọ ibuso Ishmel nwa Netanaya agha. Ha chụkwutere ya nʼebe dị nso nʼiyi ukwu Gibiọn.

13Mgbe ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha hụrụ Johanan nwa Kariya na ndịisi agha so ya, ha ṅụrịrị ọṅụ.

14Ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha na Mizpa, chigharịrị gafee nʼebe Johanan nwa Kariya nọ.

15Ma Ishmel nwa Netanaya, na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị Johanan. Ha gbalagara nʼala ndị Amọn.

16Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.