Jeremaya 41

Ha duuru ha na-aga, ma kwụsị nʼobodo Gerut Kimham, nke dị nso na Betlehem, ebe ha bu nʼobi ịga Ijipt,

Jeremiah 41:17 (UKJV) And they departed, and dwelt in the habitation of Chimham, which is by Bethlehem, to go to enter into Egypt,

15Ma Ishmel nwa Netanaya, na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị Johanan. Ha gbalagara nʼala ndị Amọn.

16Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe.

17Ha duuru ha na-aga, ma kwụsị nʼobodo Gerut Kimham, nke dị nso na Betlehem, ebe ha bu nʼobi ịga Ijipt,

18nʼihi ịgbanarị ndị Babilọn. Ha tụrụ egwu ihe ndị Babilọn ga-eme ha nʼihi ogbugbu Ishmel nwa Netanaya gburu Gedaliya nwa Ahikam, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ bụrụ onye na-achị ala ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.