Jeremaya 49

Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’

Jeremiah 49:4 (UKJV) Wherefore glory you in the valleys, your flowing valley, O backsliding daughter? that trusted in her treasures, saying, Who shall come unto me?

2Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha, nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn. A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe. A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa ndị ahụ niile chụpụrụ ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

3“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.

4Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’

5Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu mee ka oke egwu bịakwasị gị,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya, “A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu. Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.

6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.