28ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ. Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ; ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi. Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna; ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.
29M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?” ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ. “M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?
30“Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke emeela nʼala a.
31Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”