16Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe.
17“Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
18Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
19Ma onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
20“Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha, na ngwa agha m ga-eji gaa nʼihu agha. Gị ka m ga-eji tipịa mba niile dị iche iche, gị ka m ga-eji laa alaeze niile nʼiyi;