40“Aga m akpụdata ha, dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka ebule na mkpi.
41“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha, jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha. Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile!
42Osimiri ga-eri Babilọn, mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya.
43Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu, ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara, ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya, nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.
44Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ, mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro. Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ. Mgbidi Babilọn ga-adakwa.