Jeremaya 51

“Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ. Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu. Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya. Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola, ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya.

Jeremiah 51:6 (UKJV) Flee out of the midst of Babylon, and deliver every man his soul: be not cut off in her iniquity; for this is the time of the LORD's vengeance; he will render unto her a recompence.

4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.

5Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.

6“Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ. Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu. Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya. Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola, ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya.

7Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị. O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya. Ugbu a ha niile na-ayị ara.

8Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya. Kwasierenụ ya akwa ike. Wetanụ ọgwụ tee ya, ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.