27Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
28Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya, puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023.
29Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza, ka o mere ka narị mmadụ asatọ na iri atọ na abụọ, 832 si na Jerusalem gaa biri nʼala ọzọ.
30Nʼafọ nke iri abụọ na atọ, Nebuzaradan, onyeisi ndị nche alaeze Babilọn bulara ndị dị narị ndị Juu asaa na iri anọ na ise, 745 ka ha ga biri nʼala ọzọ. Ọnụọgụgụ ha niile dị puku anọ na narị isii, 4,600.
31Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ.