32Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ.
33Mgbe ahụ, ozu ndị mmadụ ndị a ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
34Mgbe ahụ, aga m eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye nʼobodo niile nke Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem kwụsị. Ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu.