24kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a: na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ, Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere, na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa. Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
25“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.
26Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”