16Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
17Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
18Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ,
19na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
20Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,