20Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,
21kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile, ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.”
22Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.