9Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu? Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?
10Ọ ghaghị ịbara unu mba ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.
11Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji? Egwu ya ọ dịghị atụ unu?
12Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ; okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.
13“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu; ihe ọ pụtara ya pụta.