5Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.
6Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m; geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.
7Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide? Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?
8Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe? Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?
9Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu? Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?