Job 3

“Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’

Job 3:3 (UKJV) Let the day perish wherein I was born, and the night in which it was said, There is a male child conceived.

1Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.

2Job sịrị:

3“Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’

4Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị: ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya; ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya.

5Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.