Jọn 1

Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.

John 1:12 (UKJV) But as many as received him, to them gave he power to become the sons of God, even to them that believe on his name:

10Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ.

11Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya.

12Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.

13Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.

14Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.