33Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’
34Mụ onwe m ahụla ya, na-agbakwa ama na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
35Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ.
36Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.”
37Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs.