48Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.”
49Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
50Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.”
51Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”