1“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe.
2Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ.
3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ.