9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha.
13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ.