3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ.
4Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya.
5Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.”
6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha.
7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.