10Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.”
11Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.”
12Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma.”
13Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.
14Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla.