25Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.
26Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?”
27Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa.”
28Mgbe o kwuchara nke a, ọ gara kpọọ nwanne ya nwanyị bụ Meri, jiri nwayọọ sị ya, “Onye ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.”
29Mgbe ọ nụrụ nke a, ọ biliri ọsịịsọ ga zute ya.