49Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla.
50Ọ bụ na unu amaghị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile, karịa nʼobodo anyị niile ga-ala nʼiyi.”
51Dị ka onyeisi nchụaja nke afọ ahụ, o kwughị nke a site nʼechiche ya, kama o buru amụma na Jisọs ga-anwụ nʼihi mba ndị Juu.
52Ọ bụghị nʼihi mba ahụ naanị, kama, ka ọ kpọkọta ụmụ Chineke ndị gbasara nʼebe niile.
53Ya mere, site nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi gbuo ya.