34Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?”
35Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.
36Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya.
37Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya.
38Nke a bụ imezu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?”